English
stringlengths 0
7.15k
| Igbo
stringlengths 0
11.1k
|
---|---|
Sometimes he even attends the meetings with her . — 1 Peter 3 : 1 . | Ọ na - esodị ya aga ọmụmụ ihe mgbe ụfọdụ . — 1 Pita 3 : 1 . |
How did Jonathan know to whom he should be loyal ? | Olee otú Jọnatan si mata onye o kwesịrị ịna - akwado ? |
When Saul said that he was going to kill David , Jonathan had a difficult decision to make . | Mgbe Sọl kwuru na ya ga - egbu Devid , ọ dịrịghị Jọnatan mfe ikpebi onye ọ ga - akwado . |
Ọ chọrọ ịna - akwado nna ya , chọọkwa ịna - akwado Devid . |
|
He wanted to be loyal to his father , but he also wanted to be loyal to David . | Jọnatan ma na ọ bụ Devid ka Chineke nọnyeere , ọ bụghị Sọl . |
Jonathan knew that God was with David and not with Saul , so he chose to be loyal to David . | N’ihi ya , o kpebiri na ya ga na - akwado Devid . |
He warned David to hide and then told Saul why he should let David live . — Read 1 Samuel 19 : 1 - 6 . | Ọ gwara Devid ka ọ gaa zoo , gwazie Sọl ihe mere o ji kwesị ịhapụ igbu Devid . — Gụọ 1 Samuel 19 : 1 - 6 . |
11 , 12 . | 11 , 12 . |
How does our love for God help us decide to be loyal to him ? | Olee otú ịhụ Chineke n’anya si enyere anyị aka ikpebi na anyị ga na - akwado ya ? |
Alice , a sister from Australia , had to decide to whom she would be loyal . | O nwere otu nwanna nwaanyị onye Ọstrelia aha ya bụ Alice . |
While she was studying the Bible , she told her family about the things she was learning . | Mgbe ọ na - amụ Baịbụl , ọ na - akọrọ ndị ezinụlọ ya ihe ndị ọ na - amụta . |
She also told them that she would not celebrate Christmas with them and explained why . | Ọ gwara ha na ya agaghịzi eso ha na - agba Krismas , gwakwa ha ihe kpatara ya . |
At first her family members were disappointed , but later they became very angry with her . | Ná mbido , obi adịchaghị ndị ezinụlọ ya ụtọ . Ma , ha mechara wesawa ya ezigbo iwe . |
They felt that Alice did not care about them anymore . | Ha chere na ihe banyere ha anaghịzi emetụ Alice n’obi . |
Then her mother said that she never wanted to see Alice again . | Mama ya gwara ya na ya achọghịzi iji anya ahụ ya . |
Alice said : “ I was shocked and deeply hurt because I really loved my family . | Alice sịrị : “ O nyeghị m ọnụ okwu . O wutere m nke ukwuu n’ihi na m hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya . ” |
Alice kpebiri onye ọ ga - akwado . |
|
Nevertheless , I resolved that Jehovah and his Son would be first in my heart , and I got baptized at the next assembly . ” — Matthew 10 : 37 . | Ọ sịrị : “ M kpebiri na Jehova na Ọkpara ya dị m mkpa karịa onye ọ bụla ọzọ . E mere m baptizim ná mgbakọ ọzọ anyị nweziri . ” — Matiu 10 : 37 . |
We must not let loyalty to anything , such as a sports team , a school , or a country , become more important to us than our loyalty to Jehovah . | Anyị ekwesịghị ikwe ka ịkwado ihe ọ bụla ọzọ , dị́ ka òtù egwuregwu , ụlọ akwụkwọ , ma ọ bụ obodo anyị dị anyị mkpa karịa ịkwado Jehova . |
For example , Henry enjoyed playing chess with his school team and wanted to win a championship for his school . | Dị ka ihe atụ , obi na - adị otu nwa okorobịa aha ya bụ Chidi ụtọ iso òtù egwuregwu e nwere n’ụlọ akwụkwọ ha na - azụ okwe e ji asọ mpi . |
Ọ chọkwara ibutere ụlọ akwụkwọ ha iko n’otu asọmpi e ji ama onye bụ́ ọkaibe . |
|
But because he played chess every weekend , he did not have enough time for the ministry or the meetings . | Ma , ọ naghịzi enwe ohere ịga ozi ọma ma ọ bụ ọmụmụ ihe n’ihi na ọ na - azụ okwe ahụ ná ngwụcha izu ọ bụla . |
Henry said that it had become more important for him to be loyal to the school than to God . | Chidi kwuru na ịkwado ụlọ akwụkwọ ha dịzi ya mkpa mgbe ahụ karịa ịkwado Chineke . |
So he decided to stop playing chess for his school . — Matthew 6 : 33 . | N’ihi ya , o kpebiri ịkwụsị okwe ahụ ọ na - azụrụ ụlọ akwụkwọ ha . — Matiu 6 : 33 . |
How can loyalty to God help us to cope with family problems ? | Olee otú ịkwado Chineke ga - esi nyere anyị aka idi nsogbu n’ezinụlọ anyị ? |
Sometimes it can be hard to be loyal to different members of our family at the same time . | N’ezinụlọ , ọ na - esi ike mgbe ụfọdụ ịma onye anyị ga - adụnyere úkwù . |
For example , Ken says : “ I wanted to visit my elderly mother regularly and to have her stay with us occasionally . | Dị ka ihe atụ , otu nwanna aha ya bụ Ken sịrị : “ M chọrọ ịna - aga ahụ mama m merela agadi mgbe niile , chọọkwa ka ọ na - abịa anọ n’ụlọ m mgbe ụfọdụ . |
But my mother and my wife did not get along well . ” | Ma , ihe anaghị adabachara mama m na nwunye m . ” |
He continues : “ I could not please one without displeasing the other . ” | O kwukwara , sị : “ O nweghị otú m ga - esi mee ihe dị́ otu onye mma n’akpasughị onye nke ọzọ iwe . ” |
Ken thought about what the Bible says and realized that in this situation , he had to please his wife and be loyal to her . | Ken chebaara ihe Baịbụl kwuru echiche ma ghọta na ya kwesịrị ime ihe ga - adị nwunye ya mma ma na - akwado ya . |
So he found a solution that his wife was happy with . Then , he explained to her why she had to be kind to his mother . | N’ihi ya , ọ chọpụtara otú ọ ga - esi dozie nsogbu ahụ , nke mere ka obi dị nwunye ya mma . |
He also explained to his mother why she should respect his wife . — Read Genesis 2 : 24 ; 1 Corinthians 13 : 4 , 5 . | Ọ gwara nwunye ya ihe mere nwunye ya ga - eji na - emere mama ya ihe ọma , gwakwa mama ya ihe mere o ji kwesị ịna - akwanyere nwunye ya ùgwù . — Gụọ Jenesis 2 : 24 ; 1 Ndị Kọrịnt 13 : 4 , 5 . |
How did Saul treat Jonathan unfairly ? | Olee ihe ndị na - adịghị mma Sọl mere Jọnatan ? |
We can also be loyal to Jehovah if a brother who is taking the lead treats us unfairly . | Anyị kwesịkwara igosi na anyị na - akwado Jehova ma okenye ọgbakọ mee anyị ihe na - adịghị anyị mma . |
King Saul was appointed by God , yet he treated his own son badly . | Ọ bụ Chineke mere Sọl eze . Ma , ihe Sọl mere nwa ya adịghị mma . |
He did not understand why Jonathan loved David . | Ọ ghọtaghị ihe mere Jọnatan ji hụ Devid n’anya . |
So when Jonathan tried to help David , Saul got very angry , and he embarrassed his son in front of many people . | N’ihi ya , mgbe Jọnatan gbalịrị inyere Devid aka , ezigbo iwe were Sọl , ya anọrọ n’ihu ndị mmadụ menye Jọnatan ihere . |
But Jonathan still showed respect to his father . | Ma , Jọnatan akwụsịghị ịna - akwanyere nna ya ùgwù . |
At the same time , he stayed loyal to Jehovah and to David , who was chosen by God to be the next king of Israel . — 1 Samuel 20 : 30 - 41 . | Ọ nọkwa na - akwado Jehova , na - akwadokwa Devid , bụ́ onye Chineke họọrọ ịbụ eze ọzọ ga - achị Izrel . — 1 Samuel 20 : 30 - 41 . |
If a brother treats us unfairly , how should we react ? | Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma nwanna mee anyị ihe ọjọọ ? |
In our congregations today , the brothers taking the lead try to be fair to everyone . | Taa , n’ọgbakọ anyị dị́ iche iche , ndị okenye na - agbalịsi ike ime ka obi dị onye ọ bụla mma . |
But these brothers are imperfect . | Ma ha ezughị okè . |
Because of that , it is possible that they may not understand why we have done something . | N’ihi ya , ha nwere ike ịghọtahie ihe mere anyị ji mee ihe anyị mere . |
So if we are ever misjudged or misunderstood , let us stay loyal to Jehovah . | Ọ bụrụ na ha aghọtahie anyị , ka anyị gosi na anyị na - akwado Jehova . |
In what situations must we be loyal to God and not be selfish ? | Olee mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị igosi na anyị na - akwado Chineke nakwa na anyị anaghị achọ naanị ọdịmma onwe anyị ? |
Saul wanted Jonathan to become the next king instead of David . | Sọl chọrọ ka ọ bụrụ Jọnatan ga - abụ eze ọzọ ga - achị Izrel , ọ bụghị Devid . |
But Jonathan loved Jehovah and was loyal to him . | Ma , Jọnatan hụrụ Jehova n’anya , na - akwadokwa ya . |
So instead of being selfish , Jonathan became David’s friend and kept his promise to him . | Ọ bụ ya mere Jọnatan achọghị naanị ọdịmma nke ya . Kama , o metara Devid enyi ma mezuo nkwa o kwere ya . |
In fact , anyone who loves Jehovah and is loyal to him will “ not go back on his promise , even when it is bad for him . ” | Nke bụ́ eziokwu bụ na onye ọ bụla hụrụ Jehova n’anya ma na - akwado ya agaghị agbanwe nkwa o kwere , ọ bụrụgodị na imezu ya nwere ike “ iwetara ya nsogbu . ” |
Because we are loyal to God , we will keep our promises . | Ebe ọ bụ na anyị na - akwado Chineke , anyị ga na - emezu nkwa anyị kwere . |
For example , if we make a business agreement , we will do what we agreed to do , even if this becomes difficult . | Dị ka ihe atụ , ọ bụrụ na anyị na mmadụ ekwekọrịta ihe anyị ga - eme n’okwu achụmnta ego , anyị ga - eme ihe anyị kwetara ime , ọ bụrụgodị na o siere anyị ike . |
And if we have problems in our marriage , we will show our love for Jehovah by staying loyal to our husband or wife . — Read Malachi 2 : 13 - 16 . | Anyị na di anyị ma ọ bụ nwunye anyị nwee nghọtahie , otú anyị ga - esi gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya bụ ịna - akwado di anyị ma ọ bụ nwunye anyị . — Gụọ Malakaị 2 : 13 - 16 . |
If we make a business agreement , we will do what we agreed to do because we are loyal to God ( See paragraph 16 ) | Ọ bụrụ na anyị na mmadụ ekwekọrịta n’ihe gbasara achụmnta ego , anyị ga - eme ihe anyị kwetara ime n’ihi na anyị na - akwado Chineke ( A ga - akọwa ya na paragraf nke 16 ) |
How has this study helped you ? | Gịnị ka ị mụtara n’isiokwu a ? |
We want to be loyal to God even in difficult situations , as Jonathan was . | Anyị kwesịrị ịna - akwado Chineke , ma mgbe ihe siri ike , otú Jọnatan mere . |
So let us stay loyal to our brothers and sisters when they disappoint us . | N’ihi ya , ka anyị na - akwado ụmụnna anyị mgbe ha mejọrọ anyị . |
Then we will make Jehovah’s heart rejoice , and that is what makes us happiest . | Anyị mee otú ahụ , anyị ga - eme ka obi Jehova ṅụrịa . Ọ bụ ihe ga - akacha eme anyị obi ụtọ . |
We can be sure that he will always do what is best for us and take care of us . | Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga na - emere anyị ihe ga - akacha baara anyị uru , na - elekọtakwa anyị mgbe niile . |
In the next article , we will see what we can learn from some in David’s time who were loyal and from others who were not loyal . | N’isiokwu na - esonụ , anyị ga - ahụ ihe anyị ga - amụta n’aka ụfọdụ n’ime ndị jí obi ha niile kwado Devid nakwa ndị na - akwadoghị ya . |
[ 1 ] ( paragraph 9 ) Some names have been changed . | [ 1 ] ( paragraf nke 9 ) Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha . |
We stay loyal to Jehovah : We love Jehovah and obey him always . | Anyị na - akwado Jehova : Anyị hụrụ Jehova n’anya , na - erubekwara ya isi mgbe niile . |
In difficult situations , we think of what he wants us to do and then obey him because we love him more than anyone or anything else | Mgbe ihe siri ike , anyị na - echeta ihe ọ chọrọ ka anyị mee , anyị emeekwa ya , n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya karịa onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ |
“ Superior authorities ” : The governments and officials that Jehovah allows to have authority over us . | “ Ndị ọchịchị ” : Ndị na - achị achị na ndị na - arụrụ ha ọrụ , bụ́ ndị Jehova kwere ka anyị nọrọ n’okpuru ha . |
He wants us to treat them with respect and obey them except when they want us to do something that he commands us not to do | Ọ chọrọ ka anyị na - akwanyere ha ùgwù , na - erubekwara ha isi , ọ gwụkwala ma hà chọrọ ka anyị mee ihe ọ sịrị anyị emela |
“ What is Jehovah requiring of you ? | |
Only to exercise justice , to cherish loyalty , and to walk in modesty with your God ! ” — MICAH 6 : 8 . | “ Gịnị ka Jehova na - achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na - eje ije ? ” — MAỊKA 6 : 8 . |
SONGS : 63 , 43 | ABỤ : 63 , 43 |
Who deserves our loyalty ? | Ole ndị ka anyị kwesịrị ịna - akwado ? |
Why was Jonathan’s reaction to David so different from Abner’s ? | Gịnị mere otú Jọnatan si meso Devid si dị́ iche n’otú Abna si meso ya ? |
What qualities will help us to be loyal to God , and how ? | Olee àgwà ndị ga - enyere anyị aka ịna - akwado Chineke , oleekwa otú ha ga - esi nyere anyị aka ? |
1 , 2 . | 1 , 2 . |
How did David show that he was loyal to God ? | Olee otú Devid si gosi na ọ na - akwado Chineke ? |
( See opening picture . ) | ( Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a . ) |
SAUL and his 3,000 soldiers were looking for David in the wilderness of Judah to kill him . | E NWERE mgbe Sọl na puku ndị agha ya atọ nọ na - achọ Devid n’ala ịkpa Juda ka ha gbuo ya . |
But one night , David and his men found the place where Saul and his soldiers were camped . | Ma n’otu abalị , Devid na ndị ikom ya hụrụ ebe Sọl na ndị agha ya mara ụlọikwuu . |
They were all asleep , so David and Abishai walked carefully past the soldiers and found Saul . | Ha niile nọ n’ụra . N’ihi ya , Devid na Abishaị ji nwayọọ gafere ndị agha ahụ niile ma hụ Sọl . |
Abishai whispered to David : “ Let me pin him to the ground with the spear just once , and I will not need to do it twice . ” | Abishaị takwụnyeere Devid , sị : “ Hapụ m ka m jiri ube a magide ya n’ala naanị otu ugboro , agaghị m ama ya ugboro abụọ . ” |
But David would not let him kill Saul . | Ma Devid ekweghị ka o gbuo Sọl . |
He told Abishai : “ Do not harm him , for who can lift his hand against the anointed of Jehovah and remain innocent ? ” | Ọ sịrị Abishaị : “ Egbula ya , n’ihi na ònye setịworo aka ya metụ onye Jehova tere mmanụ ma ka bụrụ onye aka ya dị ọcha ? ” |
Then David said : “ It is unthinkable from Jehovah’s standpoint for me to lift my hand against the anointed of Jehovah ! ” — 1 Samuel 26 : 8 - 12 . | Devid sịkwara : “ Tụfịakwa ! Dị ka Jehova si ele ihe anya , agaghị m esetị aka m metụ onye Jehova tere mmanụ . ” — 1 Samuel 26 : 8 - 12 . |
David understood what he needed to do to be loyal to Jehovah . | Devid ma ihe o kwesịrị ime iji gosi na ọ na - akwado Jehova . |
He knew he should respect Saul , and he did not even think of hurting him . | Ọ ma na ya kwesịrị ịna - akwanyere Sọl ùgwù . O chetụdịghị echiche imerụ ya ahụ́ . |
Why ? | N’ihi gịnị ? |
Because God had chosen Saul to be king of Israel . | Ọ bụ n’ihi na Chineke họọrọ Sọl ka ọ bụrụ eze ndị Izrel . |
Today , as in the past , Jehovah wants all of his servants to be loyal to him and respect those whom he allows to have authority . — Read Micah 6 : 8 . | Taa , Jehova chọkwara ka ndị ohu ya niile na - akwado ya ma na - akwanyere ndị ọ hapụrụ ka ha bụrụ ndị ọchịchị ma ọ bụ ndị na - elekọta ndị ọzọ ùgwù . — Gụọ Maịka 6 : 8 . |
How was Abishai loyal to David ? | Olee otú Abishaị si kwado Devid ? |
Abishai respected David because he knew that God had chosen David to be king . | Abishaị kwanyeere Devid ùgwù n’ihi na ọ ma na Chineke họọrọ Devid ka ọ bụrụ eze . |
Yet after becoming king , David committed serious sins . | Ma mgbe Devid ghọchara eze , o mere mmehie ndị dị́ oké njọ . |
He had sexual relations with Uriah’s wife and then told Joab to make sure that Uriah would be killed in battle . | Ya na nwunye Yuraya nwere mmekọahụ , ya agwa Joab ka ọ hụ na e gburu Yuraya n’agha . |
Joab was Abishai’s brother , so Abishai may have heard about what David did , but he continued to respect David . | Ebe Abishaị bụ nwanne Joab , o nwere ike ịbụ na Abishaị nụrụ ihe ahụ Devid mere . |
In addition , Abishai was a military leader and could have used this authority to make himself king , but he never did . | Ma , ọ kwụsịghị ịkwanyere Devid ùgwù . Ihe ọzọ bụ na Abishaị bụ ọchịagha . |
A sị na ọ chọrọ , ọ gaara eji ikike a o nwere mee onwe ya eze . |
|
Instead , he served David and protected him from his enemies . — 2 Samuel 10 : 10 ; 20 : 6 ; 21 : 15 - 17 . | Ma , o meghị otú ahụ . Kama , o jeere Devid ozi ma chebe ya ka ndị iro ghara igbu ya . — 2 Samuel 10 : 10 ; 20 : 6 ; 21 : 15 - 17 . |
( a ) How was David an example of loyalty to God ? | ( a ) Olee otú Devid si gosi na ọ na - akwado Chineke ? |
( b ) What other examples will we consider ? | ( b ) Olee ndị ọzọ anyị ga - amụ banyere ha ? |
David was loyal to Jehovah all his life . | Devid kwadoro Jehova ruo mgbe ọ nwụrụ . |
When he was young , he killed the giant Goliath , who was insulting Jehovah and the Israelites . | Mgbe ọ ka na - eto eto , o gburu dike a na - akpọ Golayat bụ́ onye nọ na - akparị Jehova na ndị Izrel . |
When David was king , Jehovah’s prophet Nathan had to correct him for the sins he committed . | Mgbe Devid bụ eze , Netan bụ́ onye amụma Jehova gbaziri ya n’ihi mmehie ndị o mere . |
Immediately , David admitted that he had sinned , and he repented . | Devid kwetara ozugbo na o mehiere ma chegharịa . |
Later , when David was an old man , he gave many valuable things to help build Jehovah’s temple . | Mgbe Devid kara nká , o wetara ọtụtụ ọlaedo na ihe ndị ọzọ a ga - eji rụọ ụlọ nsọ Jehova . |